2. Ihe Emere 29:24-36 Bible Nso (IGBOB)

24. ndi-nchu-àjà we b͕ue ha, were ọbara-ha chua àjà-nmehie n'ebe-ichu-àjà, ikpuchiri Israel nile nmehie: n'ihi na eze siri, Ọ diri Israel nile, bú àjà-nsure-ọku a na àjà-nmehie a.

25. O we guzo ndi Livai n'ulo Jehova, ndi chiri ájà, na une, na ubọ-akwara, dika ihe ahu si di nke Devid, na Gad, bú onye-ọhu-uzọ nke eze, na Netan, bú onye-amuma, nyere n'iwu: n'ihi na o sitere n'aka Jehova, bú ihe ahu enyere n'iwu, site n'aka ndi-amuma-Ya.

26. Ndi Livai we chiri ihe Devid guzo, ndi-nchu-àjà chiri kwa opì.

27. Hezekaia we si ka esure àjà-nsure-ọku n'ebe-ichu-àjà. Ma na mb͕e amalitere isure àjà-nsure-ọku, amalitere ibù abù Jehova, na ifù opì nile, na ikpọ ihe nile bu ubọ nke Devid, bú eze Israel.

28. Nkpọkọta ahu nile nākpọ kwa isi ala, ndi-ọbù-abù nābù kwa, ndi nāfù opì nāfù kwa: anēme ihe a nile rue mb͕e achubìri àjà-nsure-ọku.

29. Ma mb͕e ha surebìsiri àjà-nsure-ọku, eze na ndi nile ahuru n'ebe ọ nọ ruru ala, we kpọ isi ala.

30. Hezekaia, bú eze, na ndi-isi we si ndi Livai ka ha were okwu nke Devid, na nke Esaf, bú onye-ọhu-uzọ, to Jehova. Ha we to Chineke rue ọṅù, ha we rube isi kpọ isi ala.

31. Hezekaia we za, si, Ub͕u a unu emejuwo aka-unu n'ebe Jehova nọ, bianu nso webata àjà na àjà-ekele n'ulo Jehova. Nkpọkọta Juda we webata àjà na àjà-ekele; onye ọ bula nke nwere afọ-ofufo weta-kwa-ra àjà-nsure-ọku.

32. Ọnu-ọgugu àjà-nsure-ọku, nke nkpọkọta Juda wetara, we di ọgu oke-ehi atọ na iri, na ọgu ebulu ise, na ọgu umu-aturu iri: ndia nile bu ihe àjà-nsure-ọku ichuru Jehova.

33. Ihe edoro nsọ di kwa nnù oke-ehi na ọgu iri, na nnù aturu asa na ọgu iri.

34. Nání na ndi-nchu-àjà di ole-na-ole, ha apughi kwa ib͕a akpukpọ anu àjà-nsure-ọku nile: umu-nne-ha, bú ndi Livai, we me ka ha di ike, rue mb͕e ejebìri ozi ahu, ru kwa mb͕e ndi-nchu-àjà doro onwe-ha nsọ: n'ihi na ndi Livai nwere obi ziri ezi kari ndi-nchu-àjà ido onwe-ha nsọ.

35. Ọzọ kwa, àjà-nsure-ọku bara uba, tiyere abuba nke àjà-udo nile, tiye-kwa-ra àjà-ihe-ọṅuṅu nile nke diri àjà-nsure-ọku. Ewe dozie òfùfè ulo Jehova.

36. Hezekaia we ṅuria, ya na ndi-ya nile, n'ihi ihe nke Chineke doziri nye ndi ahu: n'ihi na ọ bu na mberede ka ihe a mere.

2. Ihe Emere 29