1. Ndi Kọrint 7:20-28 Bible Nso (IGBOB)

20. Onye ọ bula, nime ọkpukpọ ahu eji kpọ ya, ya nọgide n'ọkpukpọ ahu.

21. Àkpọrọ gi mb͕e i bu orù? ya eb͕ula gi nb͕u n'obi: ma ọ buru kwa na i puru inwe onwe-gi, kari nke ahu were ya me ihe.

22. N'ihi na onye akpọrọ nime Onye-nwe-ayi, mb͕e ọ bu orù, ọ bu onye Onye-nwe-ayi mere ka o nwere onwe-ya: otú a onye akpọrọ, mb͕e o nwere onwe-ya, ọ bu orù Kraist.

23. Ewere ọnu-ahia b͕ara unu; unu aghọla ndi-orù madu.

24. Umu-nnam, onye ọ bula, nime ọnọdu nke akpọrọ ya, ya nọgide n'ọnọdu ahu n'ebe Chineke nọ.

25. Ma enweghi m ihe Onye-nwe-ayi nyere n'iwu bayere umu-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke: ma enyem ìzùm, dika onye Onye-nwe-ayi meworo ebere ka m'buru onye kwesiri ntukwasi-obi.

26. Ya mere, anamechè na nka di nma n'ihi nkpà di ub͕u a, bù, na ọ di nma ka madu di otú ọ di.

27. Ékekọwo gi na nwunye? achọla ntọpu. Àtọpuwo gi n'aru nwunye? achọla nwunye.

28. Ma asi kwa na ọ bu ezie na i luru nwunye, i mehieghi; asi kwa na nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke lakuru di, o mehieghi. Otú ọ di, ndi di otú a gēnwe nkpab͕u n'anu-aru-ha: ma mu onwem nēmere unu ebere.

1. Ndi Kọrint 7