5. Gini kwa bu Apọlos? gini bu kwa Pọl? Ndi nēje ozi, ndi unu si n'aka-ha kwere; dika Onye-nwe-ayi nye-kwa-ra ha abua n'otù n'otù.
6. Mu onwem kuru osisi, Apọlos kwọsara ya miri; ma ọ bu Chineke nēme ka ọ nāba uba.
7. Ya mere onye nāku abughi ihe ọ bula, onye nākwọsa miri abughi kwa ihe ọ bula; kama Chineke, Onye nēme ka ọ nāba uba, bu ihe nile.
8. Ma onye nāku na onye nākwọsa miri bu otù: ma ha abua n'otù n'otù gānata ugwọ-ọlu nke aka ha, onye ọ bula dika ndọb͕u ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu si di.
9. N'ihi na ayi bu ndi ha na Chineke nālukọ ọlu: unu bu ubi Chineke, buru kwa ulo Chineke nēwu.
10. Dika amara Chineke nke enyerem si di, dika onye-isi-ọ̀kà nke mara ihe, atọrọm ntọ-ala; onye ọzọ nēwu kwa ulo n'elu ya. Ma ka onye ọ bula lezi anya otú ọ nēwu ulo n'elu ya.
11. N'ihi na ọ dighi onye ọ bula puru itọ ntọ-ala ọzọ ma-ọbughi Nke atọworo, Nke bu Jisus Kraist.
12. Ma ọ buru na onye ọ bula ewukwasi ọla-edo, ọla-ọcha, nkume di oké ọnu, osisi, ahihia, okporo-ọka, n'elu ntọ-ala ahu;
13. agēme ka ọlu nke madu nile n'otù n'otù puta ìhè: n'ihi na ubọchi ahu gēgosi ya, n'ihi na agaje ikpughe ya n'ọku; ọku onwe-ya gānwa kwa ọlu madu nile n'otù n'otù, aha ọlu ọ bu.
14. Ọ buru na ọlu onye ọ bula gādigide nke o wukwasiri ya, ọ gānata ugwọ-ọlu.