1. Ndi Kọrint 15:40-55 Bible Nso (IGBOB)

40. Aru nke elu-igwe na aru nke uwa di kwa: ma ebube nke aru nke elu-igwe bu otù, ebube nke aru nke uwa di kwa iche.

41. Otù ebube nke anyanwu di, ebube ọzọ nke ọnwa di kwa, ebube ọzọ nke kpakpando di kwa; n'ihi na otù kpakpando di iche n'aru kpakpando ọzọ n'ebube.

42. Otú a ka nbilite-n'ọnwu nke ndi nwuru anwu di kwa. Anāgha ya n'ire-uré; anēme ka o si n'ọnwu bilie n'ereghi-uré:

43. anāgha ya n'ihe-ihere; anēme ka o si n'ọnwu bilie n'ebube: anāgha ya n'adighi-ike; anēme ka o si n'ọnwu bilie n'ike:

44. anāgha ya aru nke nkpuru-obi nāchi; anēme ka o si n'ọnwu bilie aru nke Mọ di nime ya nāchi. Ọ buru na aru nke nkpuru-obi nāchi di, aru nke Mọ nāchi di kwa.

45. Otú a ka edewo-kwa-ra ya n'akwukwọ, si, Madu mbu, bú Adam, ghọrọ nkpuru-obi di ndu. Adam ikpe-azu ghọrọ mọ nke nēnye ndu.

46. Otú ọ di, nke Mọ nāchi ebughi uzọ, kama ọ bu nke nkpuru-obi nāchi; emesia nke Mọ nāchi soro.

47. Madu mbu sitere n'ala, eji-kwa-ra ájá kpu ya: Madu nke-abua sitere n'elu-igwe.

48. Aha madu onye ahu ejiri ájá kpu di, madu di otú a ka ndi eji ájá kpu di kwa: ọzọ, aha madu Onye elu-igwe ahu di, madu di otú a ka ndi elu-igwe di kwa.

49. Dika ayi yiri kwa onyinyo nke onye ahu eji ájá kpu, ayi gēyiri kwa onyinyo nke Onye elu-igwe ahu.

50. Ma nka ka m'nēkwu, umu-nnam, na anu-aru na ọbara apughi iketa ala-eze Chineke; ihe nēre uré eketaghi kwa ereghi-uré.

51. Le, agwam unu ihe-omimi: Ọ bughi ayi nile gāda n'ura ọnwu, ma agēnwo ayi nile,

52. n'oge dikarisiri ntà, n'otù ntabi-anya, mb͕e agāfù opì ikpe-azu: n'ihi na agāfù opì, agēme kwa ka ndi nwuru anwu si n'ọnwu bilie nāpughi ire uré, agēnwo kwa ayi onwe-ayi.

53. N'ihi na aru a nke puru ire uré aghaghi iyikwasi ereghi-uré, aru a nke puru inwu anwu aghaghi iyikwasi anwughi-anwu.

54. Ma mb͕e ọ bula aru a nke puru ire uré gēyikwasiwori ereghi-uré, mb͕e aru a nke puru inwu anwu gēyikwasiwori anwughi-anwu kwa, mb͕e ahu okwu ahu edeworo n'akwukwọ nsọ gēme, bú, Eloro ọnwu rue nmeri.

55. Ọnwu, òle ebe nmeri-gi di? Ọnwu, òle ebe ihe-ọb͕ub͕a-gi di?

1. Ndi Kọrint 15