1. Onye ọ bula nke kwere na Jisus bu Kraist ahu, amuwo ya site na Chineke: ọzọ onye ọ bula nke nāhu Onye ahu Nke muru n'anya, ọ nāhu kwa onye ahu nke amuworo site na Ya n'anya.
2. Nime nka ka ayi mara na ayi nāhu umu Chineke n'anya, mb͕e ọ bula ayi nāhu Chineke n'anya, me kwa ihe nile O nyere n'iwu.
3. N'ihi na nka bu ihu-n'anya Chineke, ka ayi debe ihe nile O nyere n'iwu: ihe O nyere n'iwu adighi kwa arọ́.
4. N'ihi na ihe ọ bula nke amuworo site na Chineke nēmeri uwa: nka bu kwa nmeri nke meriworo uwa, bú okwukwe-ayi.
5. Ma ònye bu onye nēmeri uwa, ma-ọbughi onye ahu nke kwere na Jisus bu Ọkpara Chineke?
6. Nka bu Onye ahu Nke were miri na ọbara bia, bú Jisus Kraist; ọ bughi nání nime miri ahu, kama ọ bu nime miri ahu na nime ọbara ahu.
7. Ọ bu kwa Mọ Nsọ bu Onye nāb͕a àmà, n'ihi na Mọ ahu bu ezi-okwu.
8. N'ihi na ndi ahu ndi nāb͕a àmà di atọ, bú Mọ ahu, na miri ahu, na ọbara ahu: ha atọ diri ime otù ihe ahu.
9. Ọ buru na ayi anata àmà nke madu, àmà nke Chineke ka ya uku: n'ihi na àmà nke Chineke bu nka, na Ọ b͕awo àmà bayere Ọkpara-Ya.
10. Onye kwere n'Ọkpara Chineke nwere àmà ahu nime ya: onye nēkweghi okwu Chineke emewo Ya onye-ugha; n'ihi na o kweghi n'àmà ahu nke Chineke b͕aworo bayere Ọkpara-Ya.
11. Àmà ahu bu nka, na Chineke nyere ayi ndu ebighi-ebi, ndu ahu di nime Ọkpara-Ya.
12. Onye nwere Ọkpara ahu nwere ndu ahu; onye nēnweghi Ọkpara Chineke enweghi ndu ahu.
13. Ihe ndia ka m'degara unu n'akwukwọ, bú ndi kwere n'aha Ọkpara Chineke, ka unu we mata na unu nwere ndu ebighi-ebi.
14. Nkwuwa-okwu ahu nke ayi nwere n'ebe Ọ nọ bu nka, na ọ buru na ayi ariọ ihe ọ bula dika ọchichọ-Ya si di, Ọ nānu olu-ayi: