7. Inyinya nwere ume pu-kwa-ra, chọ ije ka ha we jegharia n'uwa: o we si, J nu, jegharia n'uwa. Ha we jegharia n'uwa.
8. O we kpọsiem òkù ike gwam okwu, si, Le, Ndi ahu nke nāpu rue ala Ugwu emewo ka Mọm zue ike n'ala Ugwu.
9. Okwu Jehova we ruem nti, si,
10. Nara ihe n'aka ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, bú n'aka Heldai, na n'aka Tobaija, na n'aka Jedaia; gi onwe-gi bia kwa n'ubọchi ahu, bata n'ulo Josaia nwa Zefanaia, bú nke ha biaruworo site na Babilon;
11. e, nara ọla-ọcha na ọla-edo, kpua okpu-eze, kpube n'isi Joshua nwa Jehozadak, bú onye-isi-nchu-àjà;
12. gwa ya okwu, si, Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha kwuru, si, Le, otù onye nke Ihe-opupú bu aha-ya; ọ bu kwa n'ọnọdu-ya ka ọ gēsi pú, ọ gēwu kwa ulo uku Jehova:
13. ọbuná ya onwe-ya gēwu ulo uku Jehova; ọ bu kwa ya onwe-ya gēburu ebube nile, nọdu nāchi n'oche-eze-ya; otù onye-nchu-àjà gādi kwa n'oche-eze-ya: ndum-ọdu udo gādi kwa n'etiti ha abua.