Nara ihe n'aka ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, bú n'aka Heldai, na n'aka Tobaija, na n'aka Jedaia; gi onwe-gi bia kwa n'ubọchi ahu, bata n'ulo Josaia nwa Zefanaia, bú nke ha biaruworo site na Babilon;