Zekaraia 5:8-11 Bible Nso (IGBOB)

8. O we si, Nka bu Nmebi-iwu; o we tubà ya n'etiti ephah ahu: o we tukwasi nkume opù ahu n'ọnu-ya.

9. M'we welie anyam abua, hu, ma le, ndinyom abua nāputa, ifufe di kwa na nkù-ha, n'ihi na ha nwere nkù abua dika nkù ub͕ala: ha we bulie ephah ahu n'etiti ala na elu-igwe.

10. M'we si mọ-ozi ahu nke nāgwam okwu, Òle ebe ka ndia nēbuga ephah ahu?

11. O we sim, Iwuru ya ulo n'ala Shaina: mb͕e edozisiri ya, agādọba ya n'ebe ahu n'ihe-ndọkwasi-ya.

Zekaraia 5