Zekaraia 2:1-5 Bible Nso (IGBOB)

1. M'we welie anyam, hu, ma le, otù onye nke eriri-ọtùtù di n'aka-ya.

2. M'we si, Òle ebe gi onwe-gi nēje? Ọ sim, Itù Jerusalem, ihu ka obosara-ya ra, na ka ogologo-ya ra.

3. Ma, le, mọ-ozi nke nagwām okwu nāpu, mọ-ozi ozọ nāpu kwa izute ya,

4. si ya, B͕a ọsọ, gwa nwa-okorọbia nka okwu, si, N'obodo di iche iche nēnweghi mb͕idi ka Jerusalem gēbi, site n'iba-uba madu na anumanu di nime ya.

5. N'ihi na Mu onwem gāburu ya mb͕idi ọku buruburu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), ọ bu kwa ebube ka M'gāghọ n'etiti ya.

Zekaraia 2