M'we si, Gini ka ndia nābia ime? O kwue, si, Ndia bu mpi ndi sọsara Juda, onye ọ bula we ghara iweli isi-ya: ma ndia abiawo ime ka ha ma jijiji, ituda mpi nile nke mba nile, ndi buliri mpi-ha imegide ala Juda isọsa ya.