Ọpupu 9:3-16 Bible Nso (IGBOB)

3. le, aka Jehova di n'aru anu-ulo-gi nke di n'ọhia, n'aru inyinya-gi nile, na n'aru inyinya-ibu-gi nile, na n'aru camel-gi nile, na n'aru ìgwè ehi-gi, na n'aru ìgwè ewu na aturu-gi: ajọ ọria nke nēfe efe, nke di arọ́ nke-uku, gādi.

4. Jehova gākpa ókè n'etiti anu-ulo Israel na anu-ulo Ijipt: ọ dighi ihe gānwupu n'ihe nile umu Israel nwere.

5. Jehova we debe mb͕e akara àkà, si, Echi ka Jehova gēme ihe a n'ala nka.

6. Jehova we me ihe ahu n'echi-ya, anu-ulo Ijipt nile we nwua: ma nime anu-ulo umu Israel ọ dighi otù nwupuru.

7. Fero we ziga, ma, le, ọ dighi ma ọbuná otù nwupuru nime anu-ulo Israel. Obi Fero we di arọ́, o zipughi kwa ndi Israel.

8. Jehova we si Moses na Eron, Kporonu n'onwe-unu ntu oké ọku nju aka abua, ka Moses wu kwa ya n'iru elu-igwe n'anya Fero.

9. Ọ gāghọ uzuzu ntà n'elu ala Ijipt nile, ọ gāghọ kwa etuto nāb͕apú nb͕apú n'aru madu na n'aru anumanu, n'ala Ijipt nile.

10. Ha we kporo ntu oké ọku, guzo n'iru Fero; Moses we wua ya n'iru elu-igwe; o we ghọ ihe etuto nāb͕apú nb͕apú n'aru madu na n'aru anumanu.

11. Ndi-ode-akwukwọ di nsọ apughi kwa iguzo n'iru Moses, n'ihi ihe-ofifi ahu; n'ihi na ihe-etuto ahu di n'aru ndi-ode-akwukwọ di nsọ, na n'aru ndi Ijipt nile.

12. Jehova we me ka obi Fero di ike, ọ geghi kwa ha nti; dika Jehova gwara Moses.

13. Jehova we si Moses, Bilie n'isi-ututu, guzo onwe-gi n'iru Fero, si ya, Otú a ka Jehova, bú Chineke nke ndi-Hibru, siri, Zipu ndim, ka ha we fèm.

14. N'ihi na ọ bu na mb͕e a ka Mu gaje izite ihe-otitim nile n'obi-gi, na n'aru ndi-orù-gi, na n'aru ndi-gi; ka i we mara na ọ dighi onye di kam n'uwa nile.

15. N'ihi na ub͕u a M'gēsetipuwori akam, were ajọ ọria nēfe efe tib͕u gi na ndi-gi, ewe zopu gi n'uwa:

16. ma otú ọ di ọ bu n'ihi nka ka M'guzoworo gi, ka M'we me ka i hu ikem, ka ewe kọ kwa akukọ aham n'uwa nile.

Ọpupu 9