Ọpupu 8:4-24 Bible Nso (IGBOB)

4. ọ bu kwa n'aru gi, na n'aru ndi-gi, na n'aru ndi-orù-gi nile, ka awọ ahu gārigo.

5. Jehova we si Moses, Si Eron, Setipu aka-gi, ya na nkpa-n'aka-gi, n'elu osimiri nile, na n'elu osimiri Nail nile, na n'elu ọdọ-miri nile, me ka awọ rigota n'ala Ijipt.

6. Eron we setipu aka-ya n'elu miri nile nke Ijipt; awọ we rigo, kpuchie ala Ijipt.

7. Ndi-ode-akwukwọ di nsọ we were ihe-nzuzo-ha di iche iche me otú a, we me ka awọ rigo n'elu ala Ijipt.

8. Fero we kpọ Moses na Eron, si, Riọnu Jehova, ka O wezuga awọ n'ebe m'nọ, na n'ebe ndim nọ; m'gēzipu kwa ndi Israel, ka ha we chuara Jehova àjà.

9. Moses we si Fero, Nya isi n'arum: òle mb͕e ka m'gāriọrọ gi aririọ, riọ-kwa-ra ndi-orù-gi, riọ-kwa-ra ndi-gi, ka ekpochapu awọ n'ebe i nọ na n'ebe ulo-gi nile di? nání n'osimiri Nail ka ha gāfọdu.

10. Ọ si, Echi. Ọ si, Ya di ka okwu-gi si di: ka i we mara na ọ dighi onye di ka Jehova, bú Chineke-ayi.

11. Awọ gēwezuga onwe-ha n'ebe i nọ, na n'ebe ulo-gi nile di, na n'ebe ndi-orù-gi nọ, na n'ebe ndi-gi nọ; nání n'osimiri Nail ka ha gāfọdu.

12. Moses na Eron we si n'ebe Fero nọ pua: Moses we tikue Jehova ntiku bayere okwu awọ nke O dorori nye Fero.

13. Jehova we me dika okwu Moses si di; awọ we nwupu n'ulo nile, na n'ogige nile, na n'ubi nile.

14. Ha we chikọba ha n'obo n'obo: ala ahu we nēsì ísì.

15. Fero we hu na o bìwo, o we me ka obi-ya di arọ́, ọ geghi kwa ha nti; dika Jehova kwuru.

16. Jehova we si Moses, Si Eron, Setipu nkpa-n'aka-gi, tie ájá nke ala, ọ gāghọ kwa anwu ntà n'ala Ijipt nile.

17. Ha we me otú a; Eron we setipu aka-ya, ya na nkpa-n'aka-ya. tie ájá nke ala, anwu ntà ahu we di n'aru madu, na n'aru anumanu; ájá nile nke ala ghọrọ anwu ntà n'ala Ijipt nile.

18. Ndi-ode-akwukwọ di nsọ we were ihe-nzuzo-ha di iche iche me otú a, ime ka anwu ntà puta, ma ha apugh: anwu ntà ahu we di n'aru madu, na n'aru anumanu.

19. Ndi-ode-akwukwọ di nsọ we si Fero, Nkpisi-aka Chineke ka nka bu: obi Fero we di ike, ọ geghi kwa ha nti; dika Jehova kwuru.

20. Jehova we si Moses, Bilie n'isi-ututu, guzo onwe-gi n'iru Fero; le, ọ nāputa ije miri; i gāsi kwa ya, Otú a ka Jehova siri, Zipu ndim, ka ha we fèm.

21. N'ihi na, ma ọ buru na i dighi-ezipu ndim, le, M'gaje izite n'aru gi, na n'aru ndi-orù-gi, na n'aru ndi-gi, na nime ulo-gi nile, odudu: ulo nile nke ndi Ijipt gēju kwa n'odudu ahu, ya na ala nke ha di n'elu ya.

22. M'gēkewapu n'ubọchi ahu ala Goshen, nke ndim nēguzo n'elu ya, ya mere odudu agaghi-adi n'ebe ahu; ka i we mara na Mu onwem bu Jehova n'etiti uwa.

23. M'gētiye kwa nb͕aputa n'etiti ndim na ndi-gi: echi ka ihe-iriba-ama nka gādi.

24. Jehova we me otú a; odudu nke bara uba nke-uku we ba n'ulo Fero na ulo ndi-orù-ya: ọ bu kwa n'ala Ijipt nile ka ebibiri ala ahu n'ihi odudu.

Ọpupu 8