Ọpupu 7:21-25 Bible Nso (IGBOB)

21. Azù nke di n'osimiri Nail we nwua; osimiri Nail nēsì kwa ísì, ndi Ijipt apughi kwa iṅu miri si n'osimiri Nail puta; ọbara ahu we di n'ala Ijipt nile.

22. Ndi-ode-akwukwọ di nsọ nke Ijipt we were ihe-nzuzo di iche iche ha me otú a: obi Fero we di ike, ọ geghi kwa ha nti; dika Jehova kwuru.

23. Fero we chigharia, ba n'ulo-ya, ma o tiyeghi obi-ya ọbuná na nka.

24. Ndi Ijipt nile we gwue olùlù buruburu osimiri Nail inwe miri-ọṅuṅu; n'ihi na ha apughi iṅu miri osimiri Nail.

25. Ubọchi asa we zue, ka Jehova tisiri osimiri Nail ihe.

Ọpupu 7