1. Emesia Moses na Eron biara, si Fero, Otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, nāsi, Zipu ndim, ka ha we merem ememe n'ọzara.
2. Fero we si, Ònye bu Jehova, na m'gēge nti n'olu-Ya izipu Israel? amaghm Jehova, ọzọ kwa, m'gaghi-ezipu Israel.
3. Ha si, Chineke nke ndi-Hibru ezutewo ayi: biko, ka ayi je ije nke ubọchi atọ n'ọzara, chuara Jehova, bu Chineke-ayi, aja: ka Ọ we ghara iwere ajọ ọria nēfe efe, ma-ọbu mma-agha, zute ayi.