11. I gēte kwa ite ọsisa-miri ahu na ukwu-ala-ya manu, do ya nsọ.
12. I gēme kwa Eron na umu-ya ndikom ka ha biarue ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute ahu nso, i gēwere kwa miri sa ha aru.
13. I gēyikwasi kwa Eron uwe nsọ ahu; i gēte kwa ya manu, do ya nsọ, ka o we burum onye-nchu-àjà.
14. Ọ bu kwa umu-ya ndikom ka i gēme ka ha biarue nso, i gēyikwasi kwa ha uwe-ime:
15. i gēte kwa ha manu, dika i tere nna-ha, ka ha we burum ndi-nchu-àjà: otite-manu-ha aghaghi iburu ha ọlu-nchu-àjà ebighi-ebi rue ọb͕ọ-ha nile.
16. Moses we me ya: dika ihe nile si di nke Jehova nyere ya n'iwu, otú a ka ọ mere.
17. O rue n'ọnwa mbu n'arọ nke-abua, n'ubọchi mbu nke ọnwa ahu, na eguzoro ebe-obibi ahu ọtọ.