Ọpupu 4:7-20 Bible Nso (IGBOB)

7. Ọ we si, Tiyeghachi aka-gi n'obi-gi. (Ọ we tiyeghachi aka-ya n'obi-ya; ọ we weputa ya n'obi-ya, ma, le, ọ we dighachi ka anu-aru-ya.)

8. O gēru kwa, ma ọ buru na ha ekweghi gi, ọ buru kwa na ha egeghi nti n'ọlụ ihe-iriba-ama mbu, na ha gēkwe ọlụ ihe-iriba-ama nke ikpe-azu.

9. O gēru kwa, ma ọ buru na ha ekweghi kwa ihe-iriba-ama abua ndia, ọ buru kwa na ha egeghi nti n'olu-gi, na i gēwere ufọdu nime miri nke osimiri Nail, wusi ya n'ala-akọrọ: miri ahu nke i nēweputa n'osimiri Nail gāghọ kwa ọbara, ọ gāghọ ọbara n'ala-akọrọ.

10. Moses we si Jehova, Biko, Onye-nwe-ayi, Ọ bughi onye-ọ̀kà-okwu ka m'bu, ma-ọbu na mb͕e gara aga, ma-ọbu site na mb͕e I gwara orù-Gi okwu: n'ihi na onye ọnu-ya di arọ́, nke ire-ya di kwa arọ́, ka m'bu.

11. Jehova we si ya, Ònye tiyeworo ọnu madu nwere? ma-ọbu ònye nēme madu ka ọ buru onye-ob͕i, ma-ọbu onye nti chiri, ma-ọbu onye nāhu uzọ, ma-ọbu onye-ìsì? Ọ̀ bughi Mu onwem, bú Jehova?

12. Ma ub͕u a, je, Mu onwem gānọyere ọnu-gi, zí gi ihe i gēkwu.

13. Ma ọ siri, Biko, Onye-nwe-ayi, biko, zìe n'aka onye I gēziga.

14. Iwe Jehova we di ọku n'aru Moses, Ọ we si, Ọ̀ nọghi, bú Eron nwa-nne-gi, bú onye Livai? amawom na ya onwe-ya nēkwu okwu nke-ọma. Ọzọ kwa, le, ya onwe-ya nāputa izute gi: ma mb͕e ọ huru gi, ọ gāṅuri n'obi-ya.

15. I gāgwa kwa ya okwu, tiye okwu ndia n'ọnu-ya: Mu onwem gānọye-kwa-ra ọnu-gi, nọye-kwa-ra ọnu-ya, zí kwa unu ihe ahu unu gēme.

16. Ya onwe-ya gāgwara gi ndim okwu: ọ gēru kwa, na ya onwe-ya gāburu gi ọnu, gi onwe-gi gābu-kwa-ra ya Chineke.

17. Ọ bu kwa nkpa-n'aka nka ka i gēwere n'aka-gi, nke i gēji me ihe-iriba-ama ndia.

18. Moses we je, laghachikuru Jetro, bú nna nwunye-ya, si ya, Biko, ka m'je, laghachikuru umu-nnem ndi nọ n'Ijipt, hu ma ha nọ ndu ub͕u a. Jetro we si Moses, Je n'udo.

19. Jehova we si Moses nime Midian, Je, laghachi n'Ijipt: n'ihi na ndikom ahu nile ndi nāchọ ndu-gi anwuruwo.

20. Moses we chiri nwunye-ya na umu-ya ndikom, me ka inyinya-ibu buru ha, ọ we laghachi n'ala Ijipt: Moses we were nkpa-n'aka Chineke n'aka-ya.

Ọpupu 4