Ọpupu 39:19-34 Bible Nso (IGBOB)

19. Ha mekwara nb͕a-aka ọla-edo abua, tukwasi ha n'elu nsọtu abua nke ihe-ib͕ochi-obi ahu, n'ọnu-ọnu-ya, nke chere iru n'akuku ephod ahu nime.

20. Ha mekwara nb͕a-aka ọla-edo abua, tiye ha n'elu ubu abua nke ephod n'okpuru, n'ebe iru-ya di, na nso njikọta-ya, n'elu ihe-ọkiké ephod nke onye-ọ̀kà kpara.

21. Ha were kwa eriri-nma ogho anunu ke ihe-ib͕ochi-obi ahu na nb͕a-aka ephod site na nb͕a-aka-ya, ka ọ we di n'elu ihe-ọkiké ephod ahu nke onye-ọ̀kà kpara, ya na ka ewe ghara isi n'ephod tọpu ihe-ib͕ochi-obi ahu; dika Jehova nyere Moses iwu.

22. Ó mekwara uwe-nwuda ephod, ọ bu ọlu ọkpa-akwà, ọ busi ogho anunu ogho anunu;

23. ọnu uwe-nwuda ahu di n'etiti ya, dika ọnu nke uwe-obi agha, ọnu-ọnu ka ọnu-ya nwere buruburu, ka ewe ghara idọwa ya.

24. Ha mekwara n'ọnu-ọnu-ala uwe-nwuda ahu pomegranate nke ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ákwà akpara nke-ọma.

25. Ha mekwara ataṅu ọla-edo anāgwaghi agwa, tiye ataṅ ahu n'etiti pomegranate ahu n'elu ọnu-ọnu-ala uwe-nwuda ahu buruburu, n'etiti pomegranate ahu;

26. otù ataṅu na otù pomegranate, otù ataṅ na otù pomegranate, di n'ọnu-ọnu-ala uwe-nwuda ahu buruburu, iji je ozi; dika Jehova nyere Moses iwu.

27. Ha we mere Eron, mekwara umu-ya ndikom, uwe-ime ahu, ha bu ezi ákwà ọcha, ọlu nke ọkpa-ákwà,

28. na ákwà-nkukù-isi ahu, ọ bu ezi ákwà ọcha, na ihe ahu mara nma ike n'isi, ha bu ezi ákwà ọcha, na uwe-ukwu ahu nke ezi ákwà ọcha, ha bu ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma,

29. na ihe ahu ike n'úkwù, ọ bu ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma, na ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, ọ bu ọlu nke onye-ọdudu-ákwà; dika Jehova nyere Moses iwu.

30. Ha mekwara ihe di mbara nke okpu nsọ ahu nke onye-nchu-àjà, ọ bu ọla-edo anāgwaghi agwa, ha de ihe-odide n'elu ya, dika eb͕ub͕u nb͕a-aka-akàrà, IHE NSỌ JEHOVA NWERE.

31. Ha tiye-kwa-ra n'elu ya eriri-nma ogho anunu, itiye ya n'elu ákwà-nkukù-isi ahu n'elu; dika Jehova nyere Moses iwu.

32. Ewe me ka òfùfè nile nke ebe-obibi nke ulo-ikwū nzute gwusia: umu Israel we me dika ihe nile si di nke Jehova nyere Moses n'iwu, otú a ka ha mere.

33. Ha we butere Moses ebe-obibi ahu, Ulo-ikwū ahu, na ihe-ya nile, nko-ya nile, na ibo-ya nile, na nkpọrọ-ya nile, na ide-ya nile, na ukwu-ya nile;

34. na ihe-nkpuchi akpukpọ ebulu esijiri ọbara-ọbara, na ihe-nkpuchi akpukpọ seal, na ákwà-nb͕ochi nke ákwà-nkwuchi-ya;

Ọpupu 39