Ọpupu 38:7-17 Bible Nso (IGBOB)

7. O me ka nkpa-n'aka ahu ba na nb͕a-aka ahu n'elu akuku abua nke ebe-ichu-àjà ahu, ka ewe were ha nēbu ya; o were ibo me ya ka ọ di ka ib͕e.

8. O me-kwa-ra ite ọsisa-miri, ọ bu ọla, ukwu-ala-ya bu kwa ọla: ọ bu enyo nke ndinyom nēzukọ n'usu n'usu, ndi nēzukọ n'usu n'ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute, ka o ji me ya.

9. O me-kwa-ra ogige ahu: akuku Ndida nke chere iru na Ndida nwere ákwà-ngechi ogige ahu nke ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma, ọgu cubit ise n'ogologo:

10. ide-ha di orú, ukwu-ha di kwa orú, ha bu ọla; nkpọye nile nke ide ahu na ngegide nile ha bu ọla-ọcha.

11. Akuku Ugwu nwe-kwa-ra ọgu cubit ise, ide-ha di orú, ukwu-ha di kwa orú, ha bu ọla; nkpọye nile nke ide ahu na ngegide nile ha bu ọla-ọcha.

12. Akuku Ọdida-anyanwu nwe-kwa-ra ákwà-ngechi nke ọgu cubit abua na iri, ide-ha di iri, ukwu-ha di kwa iri; nkpọye nile nke ide ahu na ngegide nile ha bu ọla-ọcha.

13. Akuku Iru-anyanwu chere iru n'ọwuwa-anyanwu, nwekwara ọgu cubit abua na iri.

14. Ákwà-ngechi cubit iri na ise ka otù akuku ọnu-uzọ-ama-ya nwere; ide-ha di atọ, ukwu-ha di kwa atọ;

15. akuku nke-ọzọ nke ọnu-uzọ-ama-ya nwekwara: n'aka-nri na n'aka-ekpe nke ọnu-uzọ-ama ogige ahu ka ákwà-ngechi cubit iri na ise di; ide-ha di atọ, ukwu-ha di kwa atọ.

16. Ákwà-ngechi nile nke ogige ahu buruburu bu ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma.

17. Ukwu nile nke ide ahu nwere bu ọla; nkpọye nile nke ide na ngegide nile ha bu ọla-ọcha; ihe amachitara isi-ha bu kwa ọla-ọcha; ihe ahu bu kwa ihe egegidere ngegide ọla-ọcha, bú ide nile nke ogige ahu.

Ọpupu 38