Ọpupu 38:1-8 Bible Nso (IGBOB)

1. O me-kwa-ra ebe-ichu-aja nke àjà-nsure-ọku ahu, ọ bu osisi acacia: cubit ise ka ogologo-ya di, cubit ise ka obosara-ya di kwa, o nwere akuku anọ ra nrata; cubit atọ ka idi-elu-ya di kwa.

2. O me-kwa-ra mpi-ya n'elu nkuku anọ ya; mpi-ya sitere na ya: ọ machita ya ọla.

3. O me-kwa-ra ihe nile nke ebe-ichu-aja ahu, bú ite-ya nile, na osekè-ya nile, na ọkwa-nwusa-ya nile, na ndudu-ya nile, na ihe-igu-ọku-ya nile: ihe-ya nile ka o ji ọla me.

4. O we mere ebe-ichu-àjà ahu ihe-ọkpukpa, ihe eji ub͕u ọla me, n'okpuru ebe dipuru adipu buruburu ya n'okpuru, rue na nkera-ya.

5. O we wuara nsọtu anọ nke ihe-ọkpukpa ọla ahu nb͕a-aka anọ, ibu ọnọdu inara nkpa-n'aka-ya abua.

6. O me-kwa-ra nkpa-n'aka osisi acacia, machita ha ọla.

7. O me ka nkpa-n'aka ahu ba na nb͕a-aka ahu n'elu akuku abua nke ebe-ichu-àjà ahu, ka ewe were ha nēbu ya; o were ibo me ya ka ọ di ka ib͕e.

8. O me-kwa-ra ite ọsisa-miri, ọ bu ọla, ukwu-ala-ya bu kwa ọla: ọ bu enyo nke ndinyom nēzukọ n'usu n'usu, ndi nēzukọ n'usu n'ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute, ka o ji me ya.

Ọpupu 38