Ọpupu 36:21-31 Bible Nso (IGBOB)

21. Cubit iri ka ogologo nke otù ibo di, otù cubit na nkera cubit ka obosara nke otù ibo di kwa.

22. Otù ibo nwere ihe-nhiọye abua, nke ekwukọtara, otù na ibe-ya: otú a ka o mere nye ibo nile nke ebe-obibi ahu.

23. O we mere ebe-obibi ahu ibo ahu; orú ibo ka ọ mere nye akuku Ndida chere iru na Ndida:

24. ọgu ukwu ọla-ọcha abua ka o me-kwa-ra n'okpuru orú ibo ahu; ukwu abua n'okpuru otù ibo inara ihe-nhiọye-ya abua, ukwu abua kwa n'okpuru ibo ọzọ inara ihe-nhiọye-ya abua.

25. O we mere akuku nke-abua nke ebe-obibi ahu orú ibo, bú akuku Ugwu,

26. na ọgu ukwu ọla-ọcha ha abua; ukwu abua n'okpuru otù ibo, ukwu abua kwa n'okpuru ibo ọzọ.

27. Isi ebe-obibi ahu nke chere iru n'Ọdida-anyanwu ka o me-kwa-ra ibo isi nye.

28. Ibo abua ka o me-kwa-ra nye nkuku ebe-obibi ahu n'isi-ya.

29. Ha bu ihe abua ejikọtara n'otù n'okpuru, ha abua bu kwa otù ihe zuru okè rue isi-ya rue otù nb͕a-aka ahu: otú a ka o mere nye ha abua na nkuku abua ahu.

30. Ha di kwa ibo asatọ, na ukwu ọla-ọcha ha, ukwu iri na isi; ukwu abua n'okpuru otù ibo, ukwu abua kwa n'okpuru ibo ọzọ.

31. O me-kwa-ra nkpọrọ osisi acacia; ise ka o mere nye ibo otù akuku nke ebe-obibi ahu,

Ọpupu 36