Ọpupu 36:1-11 Bible Nso (IGBOB)

1. Bezalel na Ọhọliab gālu kwa ọlu, ha na nwoke ọ bula nke nwere obi amam-ihe, ndi Jehova tiyeworo amam-ihe na nghọta nime ha ka ha mara ije ozi ọ bula nke òfùfè nke ebe nsọ ahu, dika ihe nile si di nke Jehova nyere n'iwu.

2. Moses we kpọ Bezalel na Ọhọliab, na nwoke ọ bula nwere obi amam-ihe, onye Jehova tiyere amam-ihe n'obi-ya, onye ọ bula nke obi-ya kwaliri ya ibiaru nso ozi ahu ije ya:

3. ha we si n'iru Moses were ihe àjà-nbuli ahu nile nke umu Israel wetara iji je ozi nke òfùfè nke ebe nsọ ahu, ime ya. Ma ndi Israel ahu nọ n'iwetara ya onyinye-afọ-ofufo kwa-ututu.

4. Ndi-amam-ihe ahu nile, ndi nēje ozi nile nke ebe nsọ ahu, ha nile n'otù n'otù we si n'ozi-ha nke ha nēje bia,

5. gwa Moses okwu, si, Ndi Israel nēweta ọtutu ihe kari nke gēzuru òfùfè nke diri ozi ahu nke Jehova nyere iwu ka eje ya.

6. Moses we nye iwu, ha we me ka ekwusa ya n'ọmuma-ulo-ikwū nile, si, Nwoke ma-ọbu nwayi, ka ha ghara ije ozi ọzọ bayere àjà-nbuli nke ebe nsọ ahu. Ewe me ka ndi Israel wetabìe ihe.

7. Ihe-ije-ozi ahu we zuere ha iji je ozi nile, ime ya, ihe we fọdu.

8. Onye ọ bula nke nwere obi amam-ihe n'etiti ndi nēje ozi ahu we me ebe-obibi ahu: were ákwà-nkwuba iri me ya; ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma, na ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, nke emere ka ha yie cherubim, bú ọlu nke onye-ọ̀kà, ihe ndia ka o ji me ha.

9. Ogologo nke otù ákwà-nkwuba di orú cubit na asatọ, obosara nke otù ákwà-nkwuba di kwa cubit anọ: otù ọtùtù ka ákwà-nkwuba nile nwere.

10. O we jikọta ákwà-nkwuba ise, otù na ibe-ya: jikọta kwa ákwà-nkwuba ise nke-ọzọ, otù na ibe-ya.

11. O ji kwa ogho anunu me anya-nko n'elu ọnu-ọnu nke otù ákwà-nkwuba, site na nsọtu-ya nime njikọta ahu: otú a ka ọ me-kwa-ra n'ọnu-ọnu ákwà-nkwuba nke dipuru adipu nime njikọta nke-abua.

Ọpupu 36