Ọpupu 35:2-13 Bible Nso (IGBOB)

2. Ubọchi isi ka agēje ozi, ma n'ubọchi nke-asa unu gēnwe ubọchi nsọ, bú ubọchi-izu-ike nke idebe-ubọchi-izu-ike Jehova nwere: onye ọ bula nke nēje ozi nime ya, agēme ka ọ nwua.

3. Unu afunwula ọku n'ebe-obibi-unu nile n'ubọchi-izu-ike.

4. Moses we gwa nzukọ nile nke umu Israel okwu, si, Nka bu ihe Jehova nyere n'iwu, si,

5. Sinu n'etiti unu wetara Jehova àjà-nbuli: onye ọ bula nke obi-ya nwere afọ-ofufo, ya weta ya, bú àjà-nbuli nke Jehova; ọla-edo, na ọla-ọcha, na ọla;

6. na ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha, na aji ewu;

7. na akpukpọ ebulu esijiri ọbara-ọbara, na akpukpọ seal, na osisi acacia;

8. na manu itiye n'ihe nēnye ìhè, na uda di iche iche itiye na manu nke otite-manu ahu, na ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ eji uda utọ di iche iche me;

9. na nkume onyx, na nkume ihiọgide n'ihe, ihiọgide n'ephod, na ihiọgide n'ihe-ib͕ochi-obi.

10. Onye ọ bula n'etiti unu nke nwere obi amam-ihe, ha gābia kwa, me ihe nile nke Jehova nyere n'iwu;

11. ebe-obibi ahu, na ulo-ikwū-ya, na ákwà-nkpuchi-ya, na nko-ya nile, na ibo-ya nile, na nkpọrọ-ya nile, na ide-ya nile, na ukwu-ya nile,

12. na ib͕e ahu, na nkpa-n'aka-ya abua, na ebe-nkpuchi-nmehie, na ákwà-nb͕ochi nke ákwà-nkwuchi;

13. na table ahu, na nkpa-n'aka-ya abua, na ihe-ya nile, na achicha iru Chineke;

Ọpupu 35