1. Jehova we gwa Moses okwu, si, Je, si n'ebe a rigo, gi onwe-gi na ndi ahu nke i mere ka ha si n'ala Ijipt rigoputa, rue ala ahu nke M'ṅuru Abraham iyi, ṅu-kwa-ra Aisak, ṅu-kwa-ra Jekob, si, Nkpuru-gi ka M'gēnye ya:
2. M'gēziga kwa mọ-ozi n'iru gi; M'gāchupu kwa ndi Kenean, na ndi-Amorait, na ndi Het, na ndi-Perizait, na ndi-Haivait, na ndi Jebus:
3. rue ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù nime ya: n'ihi na M'gaghi-arigo n'etiti gi; n'ihi na ndi kwesiri olu ike ka i bu: ka M'we ghara ime ka i gwusia n'uzọ.
4. Ndi Israel we nu okwu ọjọ a, ha we rue újú: ọ dighi kwa onye ọ bula tiyere ihe-ichọ-nma-ya n'aru ya.
5. Jehova we si Moses, Si umu Israel, Unu onwe-unu bu ndi kwesiri olu ike: asi na ọ bu otù ntabi-anya ka M'gārigo n'etiti gi, M'gēme kwa ka i gwusia; ma ub͕u a wepu ihe-ichọ-nma-gi nile n'aru gi tọb͕ọ, M'we mara ihe M'gēme gi.
6. Umu Israel we napusi onwe-ha ihe-ichọ-nma-ha nile site n'ugwu Horeb gaba.
7. Ma Moses nēwere ulo-ikwū ahu, nāmara onwe-ya n'azu ọmuma-ulo-ikwū, n'ebe di anya site n'ọmuma-ulo-ikwū ahu; ọ we kpọ ya, Ulo-ikwū nzute. O rue, na onye ọ bula nke nāchọ Jehova nāpu je ulo-ikwū nzute ahu nke di n'azu ọmuma-ulo-ikwū.
8. O rue, mb͕e Moses puru ije Ulo-ikwū ahu, na ndi Israel nile biliri, guzo onwe-ha ọtọ, nwoke ọ bula n'ọnu-uzọ nke ulo-ikwū-ya, nēlegide Moses anya n'azu, rue mb͕e ọ bara n'Ulo-ikwū ahu.
9. O rue, mb͕e Moses batara n'Ulo-ikwū ahu, na ogidi igwe-oji ahu ridatara, guzo n'ọnu-uzọ nke Ulo-ikwū: Jehova we gwa Moses okwu.