Ọpupu 32:25-28 Bible Nso (IGBOB)

25. Moses we hu ndi ahu na ndi nādighi nchikọta ka ha bu; n'ihi na Eron emewo ka ha ghara idi nchikọta, ka ha buru ihe-ntakwu n'etiti ndi nēbili imegide ha:

26. Moses we guzo n'ọnu-uzọ-ama nke ọmuma-ulo-ikwū ahu, si, Ònye diri Jehova? ya biakutem. Umu-ndikom Livai nile we chikọta onwe-ha n'ebe ọ nọ.

27. Ọ si ha, Otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, siri, Turunu, Nwoke ọ bula n'etiti unu, ya turu mma-agha-ya n'apata-ukwu-ya, gabiganu bia-ghachi kwa site n'otù ọnu-uzọ-ama rue ọnu-uzọ-ama ọzọ n'ọmuma-ulo-ikwū a nile, b͕u-kwa-nu, nwoke ọ bula, ya b͕ue nwa-nne-ya, nwoke ọ bula, ya b͕ue eyì-ya, nwoke ọ bula, ya b͕ue onye-aru-ya.

28. Umu-ndikom Livai we me dika okwu Moses si di: ihe ra ka nnù ndikom asa na ọgu iri we si n'etiti ndi Israel da n'ubọchi ahu.

Ọpupu 32