14. Onye ọ bula nke nāgabiga n'ebe ndi agukọtaworo nọ, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, ọ gēnye àjà-nbuli nke Jehova.
15. Ọgaranya agaghi-enye kari, ma ob͕eye agaghi-enyebì kari, nkera shekel ahu, mb͕e ha nēnye àjà-nbuli nke Jehova, ikpuchiri nkpuru-obi-unu nmehie.
16. I gānara kwa ego nkpuchi-nmehie ahu n'aka umu Israel, nye ya n'òfùfè nke ulo-ikwū nzute; ka ọ we buru umu Israel ihe-ncheta n'iru Jehova, ikpuchiri nkpuru-obi-unu nmehie.
17. Jehova we gwa Moses okwu, si,
18. I gēme kwa ite ọsisa-miri, ọ gābu ọla, ukwu-ala-ya gābu kwa ọla, iji sa aru: i gētiye ya n'etiti ulo-ikwū nzute na ebe-ichu-àjà, tiye miri n'ebe ahu.
19. Eron na umu-ya ndikom gāsa aka-ha na ukwu-ha site na ya:
20. mb͕e ha nābà n'ulo-ikwū nzute, ha gāsa miri, ka ha we ghara inwu; ma-ọbu mb͕e ha nābiaru ebe-ichu-àjà nso ije ozi, isurere Jehova àjà-ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ:
21. ha gāsa kwa aka-ha na ukwu-ha, ka ha we ghara inwu: ọ gābu-kwa-ra ha ukpuru mb͕e ebighi-ebi, bú ya na nkpuru-ya rue ọb͕ọ-ha nile.