Ọpupu 29:33-37 Bible Nso (IGBOB)

33. Ha gēri kwa ha, bú ihe eji kpuchi nmehie, imeju aka-ha na ido ha nsọ: ma onye ala ọzọ agaghi-eri ha, n'ihi na nsọ ka ha di.

34. Ma ọ buru na ihe afọdu site n'anu nke nmeju-aka ahu, ma-ọbu site n'achicha, rue ututu, i gēsure kwa ihe fọduru n'ọku: agaghi-eri ya, n'ihi na nsọ ka ọ di.

35. I gēme kwa Eron, me kwa umu-ya ndikom, otú a, dika ihe nile si di nke M'nyeworo gi n'iwu: ubọchi asa ka i gēmeju aka-ha.

36. Oke-ehi nke àjà-nmehie ka i gāchu kwa bayere nkpuchi-nmehie kwa-ubọchi: i gēwepu kwa nmehie n'ebe-ichu-àjà ahu mb͕e i nēkpuchi nmehie n'elu ya; i gēte kwa ya manu, ido ya nsọ.

37. Ubọchi asa ka i gēkpuchi nmehie n'elu ebe-ichu-àjà ahu, we do ya nsọ: ebe-ichu-àjà ahu gābu kwa ebe nsọ kachasi ebe nsọ nile: ihe ọ bula nke nēmetu ebe-ichu-àjà ahu aru gādi nsọ.

Ọpupu 29