Ọpupu 28:18-23 Bible Nso (IGBOB)

18. eriri nke-abua gābu emerald na sapphire na diamond;

19. eriri nke-atọ gābu jacinth na agate na amethyst:

20. eriri nke-anọ gābu beryl na onyx na jasper: agētiye ha n'ọla-edo akpara akpà n'ebe-nhiọgide-ha.

21. Nkume ahu gādi ka aha umu Israel si di, iri na abua, dika aha-ha si di; dika eb͕ub͕u nb͕a-aka-akàrà, onye ọ bula dika aha-ya si di, ha gādiri ebo iri na abua ahu.

22. I gēme kwa n'elu ihe-ib͕ochi-obi ahu iyab͕a emere dika eriri-nma, bú ihe emere dika udọ̀ aturu atu; ha gābu ọla-edo anāgwaghi agwa.

23. I gēme kwa n'elu ihe-ib͕ochi-obi ahu nb͕a-aka ọla-edo abua, tiye nb͕a-aka abua ahu n'elu nsọtu abua nke ihe-ib͕ochi-obi.

Ọpupu 28