Ọpupu 25:3-10 Bible Nso (IGBOB)

3. Nka bu kwa àjà-nbuli ahu nke unu gānara n'aka ha; ọla-edo, na ọla-ọcha, na ọla;

4. na ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha, na aji ewu;

5. na akpukpọ ebulu esijiri ọbara-ọbara, na akpukpọ seal, na osisi acacia;

6. na manu itiye n'ihe nēnye ìhè, na uda di iche iche itiye na manu nke otite-manu ahu, na ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ eji uda utọ me;

7. na nkume onyx, na nkume di iche iche ihiọgide n'ihe, ihiọgide n'ephod na ihiọgide n'ihe-ib͕ochi-obi.

8. Ka ha me-kwa-ram ebe nsọ; ka M'we biri n'etiti ha.

9. Dika ihe nile Mu onwem nēme ka i hu, bú ihe-atù nke ebe-obibim, na ihe-atù nke ihe-ya nile, ọbuná otú a ka unu gēme ya.

10. Ha gēme kwa ib͕e osisi acacia: cubit abua na nkera ka ogologo-ya gādi, otù cubit na nkera ka obosara-ya gādi, otù cubit na nkera ka idi-elu-ya gādi.

Ọpupu 25