Ọpupu 21:21-28 Bible Nso (IGBOB)

21. Ma otú ọ di, ọ buru na otù ubọchi ma-ọbu ubọchi abua ka ọ gānọru, agaghi-abọ ọ́bọ̀-ya n'aru ya: n'ihi na ego-ya ka ọ bu.

22. Mb͕e ndikom nālu ọgu, we tie nwayi di ime ihe, ime-ya we pua, ma ajọ ihe aputagh: aghaghi iri ya nra, dika di nwayi ahu gātukwasi ya; ọ gēnye kwa site n'aka ndi-ikpé.

23. Ma ọ buru na ajọ ihe aputa, i gēme kwa ka ndu lara ndu,

24. anya lara anya, ezé lara ezé, aka lara aka, ukwu lara ukwu,

25. ida-ọku lara ida-ọku, ob͕ub͕u-mma lara ob͕ub͕u-mma, ufiri-utari lara ufiri-utari.

26. Mb͕e onye ọ bula gēti anya orù-ya nwoke, ma-ọbu anya orù-ya nwayi, ihe, we bibie ya; o gēzipu kwa ya ka ọ nwere onwe-ya n'ihi anya-ya.

27. Ọ buru kwa na ọ me ka ezé orù-ya nwoke ma-ọbu ezé orù-ya nwayi dapu; ọ gēzipu kwa ya ka o nwere onwe-ya n'ihi ezé-ya.

28. Mb͕e ehi gāsọ nwoke ma-ọbu nwayi mpì, o we nwua, aghaghi itub͕u ehi ahu na nkume, agaghi-eri kwa anu-ya; ma agāgu onye-nwe ehi ahu n'onye ikpe nāmaghi.

Ọpupu 21