6. ma anamemere nnù umu-umu abua na ọgu iri ebere, bú nke ndi nāhum n'anya, nēdebe kwa ihe nile M'nyere n'iwu.
7. Gi eburula aha Jehova, bú Chineke-gi, ime ihe efu; n'ihi na Jehova agaghi-agu onye nēburu aha-Ya ime ihe efu n'onye ikpé nāmaghi.
8. Cheta ubọchi-izu-ike, ido ya nsọ.
9. Ubọchi isi ka i gālu ọlu, je ozi-gi nile:
10. ma ubọchi nke-asa bu ubọchi-izu-ike nke Jehova, bú Chineke-gi, nwere: i gaghi-eje ozi ọ bula nime ya, gi onwe-gi, na nwa-gi nwoke, na nwa-gi nwayi, na orù-gi nwoke, na orù-gi nwayi, na anu-ulo-gi, na ọbìa-gi nke nọ nime ọnu-uzọ-ama-gi ọ bula:
11. n'ihi na n'ubọchi isi ka Jehova mere elu-igwe na uwa, na oké osimiri, na ihe nile nke di nime ha, Ọ we zuru ike n'ubọchi nke-asa: n'ihi nka ka Jehova gọziri ubọchi-izu-ike, do kwa ya nsọ.
12. Sọpuru nna-gi na nne-gi: ka ubọchi-gi we di anya n'elu ala ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi.
13. Gi eb͕ula madu.
14. Gi akwala iko.
15. Gi ezula ori.
16. Gi ab͕ala àmà ugha megide madu-ibe-gi.