Ọpupu 18:9-23 Bible Nso (IGBOB)

9. Jetro we ṅuria ọṅu bayere ezi ihe nile nke Jehova mere Israel, ndi ọ naputara n'aka ndi Ijipt.

10. Jetro we si, Onye agọziri agọzi ka Jehova bu, Onye naputaworo unu n'aka ndi Ijipt, na n'aka Fero; Onye naputaworo ndi nka n'okpuru aka ndi Ijipt.

11. Ub͕u ka m'mara na Jehova di uku kari chi nile: e, n'ihe nke ha di nganga megide ha.

12. Jetro, bú nna nwunye Moses, we were àjà-nsure-ọku na àjà di iche iche ichuru Jehova: Eron we bia, ya na ndi-okenye nile nke Israel, iso nna nwunye Moses ri nri n'iru Chineke.

13. O rue, n'echi-ya, na Moses nọduru ala ikpe ndi Israel ikpe: ndi ahu we guzo n'akuku Moses si n'ututu rue anyasi.

14. Nna nwunye Moses we hu ihe nile nke Moses onwe-ya nēme ndi Israel, ọ we si, Gini bu ihe a nke gi onwe-gi nēme ndi nka? gini mere gi onwe-gi nānọdu ala nání gi iche, ma ndi nka nile nēguzo onwe-ha n'akuku gi si n'ututu rue anyasi?

15. Moses we si nna nwunye-ya, N'ihi na ndi nka nābiakutem iju Chineke ase:

16. mb͕e ha nwere okwu, ha abiakutem; m'nēkpe kwa ikpe n'etiti madu na ibe-ya, m'nēme kwa ka ha mara ukpuru nile nke Chineke, na iwu-Ya nile.

17. Nna nwunye Moses we si ya, Ọ dighi nma, bú ihe gi onwe-gi nēme.

18. I ghaghi ikpọnwu akpọnwu dika akwukwọ, ma gi onwe-gi ma ndi nka gi na ha nọ: n'ihi na ọ di arọ́ kari gi, bú ihe a; i pughi ime ya nání gi iche.

19. Ub͕u a ge nti n'olum, m'gādu gi ọdu, ka Chineke nọyere kwa gi: gi onwe-gi buru ndi nka na ncherita-iru Chineke, gi onwe-gi webata-kwa-ra Chineke okwu nile,

20. me kwa ka ha ghọta ukpuru nile na iwu nile, gi me kwa ka ha mara uzọ ha gēje ije nime ya, na ọlu nke ha gālu.

21. Gi onwe-gi gēsi kwa na ndi nka nile leputa ndi-dìnkpà, ndi nātu egwu Chineke, ndi nēkwu ezi-okwu, ndi nākpọ urù nēzighi ezi asì; i gēdo kwa ndi ahu n'isi ha, ibu ndi-isi nnù abua na ọgu iri nnù abua na ọgu iri, na ndi-isi ọgu ise ọgu ise, na ndi-isi ọgu abua na iri ọgu abua na iri, na ndi-isi iri iri:

22. ka ha kpe ndi nka na mb͕e nile: o gēru, na oké okwu nile ọ bula ka ha gēwetara gi, ma ha onwe-ha gēkpe okwu ntà nile ọ bula: gi me ka ọ di kari nfe n'aru gi, ha gēso kwa gi buru ibu a.

23. Ọ buru na ihe a ka i gēme, ọ buru kwa na Chineke enye gi iwu, i gēnwe kwa ike iguzo; ọzọ kwa, ndi nka nile gābà kwa n'ọnọdu-ha n'udo.

Ọpupu 18