Ọpupu 18:23-27 Bible Nso (IGBOB)

23. Ọ buru na ihe a ka i gēme, ọ buru kwa na Chineke enye gi iwu, i gēnwe kwa ike iguzo; ọzọ kwa, ndi nka nile gābà kwa n'ọnọdu-ha n'udo.

24. Moses we ge nti n'olu nna nwunye-ya, me ihe nile ọ siri.

25. Moses we si n'etiti Israel nile rọputa ndi-dìnkpà, me ha ka ha buru ndi-isi ndi ahu, ndi-isi nnù abua na ọgu iri nnù abua na ọgu iri, na ndi-isi ọgu ise ọgu ise, na ndi-isi ọgu abua na iri ọgu abua na iri, na ndi-isi iri iri.

26. Ha we kpe ndi Israel ikpe na mb͕e nile: okwu nile nke siri ike ka ha nēwetara Moses, ma ha onwe-ha nēkpe okwu ntà nile.

27. Moses we zipu nna nwunye-ya; o we je nke ya, la n'ala-ya.

Ọpupu 18