7. Ma umu Israel muru ọmùmù, ri nne, ba uba, we nwe ume nke uku; ala ahu we juputa na ha.
8. Ma eze ọhuu biliri ichi Ijipt, onye nāmaghi Josef.
9. Ọ we si ndi-ya, Le, ndi umu Israel di ọtutu nwe kwa ume kari ayi:
10. ngwa, ka ayi gosi onwe-ayi na ndi mara ihe n'ebe ha nọ; ka ha we ghara iba uba, o we rue, mb͕e agha gāda n'ala-ayi, na ha gētiyekọta onwe-ha n'aru ndi nākpọ ayi asì, ha we buo agha megide ayi, si n'ala nka rigopua.
11. Ha we do ndi-isi nke ndi nēfè òfùfè n'isi ha iwere ibu-ha weda ha ala. Ha we wuere Fero obodo abua ichikobata ihe, bú Paitom na Raamses.
12. Ma dika ha nēweda ha ala, otú a ka ha nāba uba, otú a ka ha nāb͕asa kwa. Ike we gwusia ha n'ihi umu Israel.