Ọpupu 1:1-16 Bible Nso (IGBOB)

1. Ma ndia bu aha umu-ndikom Israel, ndi batara n'Ijipt; ha soro Jekob bata, nwoke ọ bula na ulo-ya.

2. Reuben, na Simeon, na Livai, na Juda;

3. Isaka, na Zebulun, na Benjamin;

4. Dan, na Naftali, na Gad, na Asha.

5. Madu nile ndi si n'úkwù Jekob puta di kwa ọgu madu atọ na iri: ma Josef, ọ nọri n'Ijipt.

6. Josef we nwua, ya na umu-nne-ya nile, na ọb͕ọ ahu nile.

7. Ma umu Israel muru ọmùmù, ri nne, ba uba, we nwe ume nke uku; ala ahu we juputa na ha.

8. Ma eze ọhuu biliri ichi Ijipt, onye nāmaghi Josef.

9. Ọ we si ndi-ya, Le, ndi umu Israel di ọtutu nwe kwa ume kari ayi:

10. ngwa, ka ayi gosi onwe-ayi na ndi mara ihe n'ebe ha nọ; ka ha we ghara iba uba, o we rue, mb͕e agha gāda n'ala-ayi, na ha gētiyekọta onwe-ha n'aru ndi nākpọ ayi asì, ha we buo agha megide ayi, si n'ala nka rigopua.

11. Ha we do ndi-isi nke ndi nēfè òfùfè n'isi ha iwere ibu-ha weda ha ala. Ha we wuere Fero obodo abua ichikobata ihe, bú Paitom na Raamses.

12. Ma dika ha nēweda ha ala, otú a ka ha nāba uba, otú a ka ha nāb͕asa kwa. Ike we gwusia ha n'ihi umu Israel.

13. Ndi Ijipt we were nkpab͕u me umu Israel ka ha fè òfùfè:

14. ha we were òfùfè siri ike me ka ndu-ha di ilu, n'urọ, na nime brick, na n'òfùfè nile ọ bula n'ọhia, òfùfè-ha nile nke ha mere ka ha fè nime ha di na nkpab͕u.

15. Eze Ijipt we si ndinyom Hibru ndi nēle ime, ndi aha otù onye nime ha bu Shifra, aha nke onye nke-abua bu kwa Pua:

16. ọ si, Mb͕e unu nēle ime ndinyom Hibru, we hu ha n'elu oche ọmumu-nwa; ọ buru na nwa-nwoke ka ọ bu, unu gēme kwa ka ọ nwua; ma ọ buru na nwa-nwayi ka ọ bu, ọ gādi kwa ndu.

Ọpupu 1