Ọnu-Ọgugu 9:9-20 Bible Nso (IGBOB)

9. Jehova we gwa Moses okwu, si,

10. Gwa umu Israel okwu, si, Nwoke ọ bula n'etiti unu ma-ọbu n'etiti ọb͕ọ-unu nile, mb͕e ọ gāru árú site na madu nwuru anwu, ma-ọbu mb͕e ọ nọ n'ije di anya, ọ gēme-kwa-ra Jehova ememe ngabiga:

11. n'ọnwa nke-abua n'ubọchi nke-iri-na-anọ n'etiti ehihie na anyasi ka ha gēme ya; tiyere achicha ekoghi-eko na ihe di iche iche nēlu ilu ka ha gēri ya:

12. ha agaghi-eme ka ihe fọdu site na ya rue ututu, ọ dighi kwa ọkpukpu ha gētiji nime ya: dika ukpuru nile nke ngabiga ahu si di ka ha gēme ya.

13. Ma nwoke nke di ọcha, nke nānọghi kwa n'ije, ma ọ rapuwo ime ememe ngabiga, agēbipu kwa madu ahu n'etiti umu-nna-ya: n'ihi a o wetaghi nso onyinye iji biaru nso Jehova na mb͕e-ya akara àkà, nwoke ahu gēbu nmehie-ya.

14. Ma mb͕e ọbìa gānọ n'etiti unu dika ọbìa, me-kwa-ra Jehova ememe ngabiga; dika ukpuru ngabiga ahu si di, na dika ikpé-ya si di, otú a ka ọ gēme: otù ukpuru ka unu gēnwe, ma ọbìa, ma onye amuru n'ala.

15. N'ubọchi eguzoro ebe-obibi ahu ọtọ igwe-oji ahu kpuchiri ebe-obibi, ọbuna ulo-ikwū nzute: ma n'anyasi ọ di n'elu ebe-obibi ahu dika ọku, n'ile ya anya, rue ututu.

16. Otú a ka ọ di mb͕e dum: igwe-oji ahu nēkpuchi ya, ya na ọku n'abali, n'ile ya anya.

17. Ma ọ di ka nrigo nke igwe-oji ahu site n'elu Ulo-ikwū si di, emesia umu Israel we bulie ije: ọ bu kwa n'ebe igwe-oji ahu bi, n'ebe ahu ka umu Israel nāma ulo-ikwū-ha.

18. N'okwu-ọnu Jehova ka umu Israel nēbuli ije, ọ bu kwa n'okwu-ọnu Jehova ka ha nāma ulo-ikwū-ha: ubọchi nile igwe-oji ahu nēbi n'elu ebe-obibi ahu ha nānọdu n'ọmuma-ulo-ikwū.

19. Mb͕e igwe-oji ahu nānọgide n'elu ebe-obibi ahu ọtutu ubọchi, umu Israel we debe ihe-ndebe nke Jehova, ha ebulighi kwa ije.

20. Mb͕e ufọdu di mb͕e igwe-oji ahu nānọ ubọchi ole-na-ole n'elu ebe-obibi ahu; n'okwu-ọnu Jehova ka ha nānọdu n'ọmuma-ulo-ikwū, ọ bu kwa n'okwu-ọnu Jehova ka ha nēbuli ije.

Ọnu-Ọgugu 9