Ọnu-Ọgugu 8:22-26 Bible Nso (IGBOB)

22. Emesia ndi Livai we ba ifè òfùfè-ha n'ulo-ikwū nzute n'iru Eron, na n'iru umu-ya ndikom: dika Jehova nyere Moses iwu bayere ndi Livai, otú a ka ha mere ha.

23. Jehova we gwa Moses okwu, si

24. Nka bu nke ndi Livai nwere: site n'onye b͕ara orú arọ na ise we gaba n'iru ha gābà ibu agha n'òfùfè nke ulo-ikwū nzute:

25. ma site n'onye b͕ara ọgu arọ abua na iri we gaba n'iru ha gēsi n'ibu-agha nke òfùfè ahu laghachi, ha agaghi-efè ọzọ;

26. ma ha gēso umu-nne-ha je ozi n'ulo-ikwū nzute, idebe ihe-ndebe, ma ọ dighi òfùfè ha gēfè. Otú a ka i gēme ndi Livai n'ihe-ndebe-ha.

Ọnu-Ọgugu 8