10. i gēme kwa ka ndi Livai biaru nso n'iru Jehova: umu Israel gēbikwasi ndi Livai aka-ha:
11. Eron gēfé ndi Livai n'iru Jehova ibu àjà-ofufé sitere n'umu Israel, ka ha we buru ndi gēfè òfùfè nke Jehova.
12. Ndi Livai gēbikwasi aka-ha n'isi oke-ehi abua ahu: gi me otù nime ha ka ọ buru àjà-nmehie, me ibe-ya ka ọ buru àjà-nsure-ọku, ichuru Jehova, ikpuchiri ndi Livai nmehie-ha.
13. I gēguzo ndi Livai n'iru Eron, na n'iru umu-ya ndikom, fé kwa ha ka ha buru àjà-ofufé ichuru Jehova.
14. I gēkewaputa kwa ndi Livai n'etiti umu Israel, ndi Livai gābu kwa ihe M'nwere.
15. Emesia ndi Livai gābà ifè ulo-ikwū nzute òfùfè: i gēme ka ha di ọcha, fé kwa ha ibu àjà-ofufé.