Ọnu-Ọgugu 8:1-6 Bible Nso (IGBOB)

1. Jehova we gwa Moses okwu, si,

2. Gwa Eron okwu, si ya, Mb͕e i nēweli oriọna asa ahu, na ncherita-iru nke iru ihe-idọba-oriọna ka oriọna asa ahu gēnye ìhè.

3. Eron we me otú a; na ncherita-iru nke iru ihe-idọba-oriọna ahu ka o weliri oriọna-ya nile, dika Jehova nyere Moses iwu.

4. Nka bu otú emere ihe-idọba-oriọna ahu, ihe akpuru akpu nke ọla-edo ka ọ bu; rue ukwu-ala-ya, ru kwa okoko-ya nile, ihe akpuru akpu ka ọ bu: dika ihe-ile-anya ahu si di nke Jehova mere ka Moses hu, otú a ka o mere ihe-idọba-oriọna ahu.

5. Jehova we gwa Moses okwu, si,

6. Weputa ndi Livai n'etiti umu Israel, me ka ha di ọcha.

Ọnu-Ọgugu 8