Ọnu-Ọgugu 6:7-9 Bible Nso (IGBOB)

7. Ọ gaghi-emeru onwe-ya bayere nna-ya, ma-ọbu bayere nne-ya, ma-ọbu bayere nwa-nne-ya nwoke, maọbu bayere nwa-nne-ya nwayi, mb͕e ha nwuru; n'ihi na nkewaputa Chineke-ya di n'isi-ya.

8. Ubọchi nile nke nkewaputa-ya nsọ ka ọ diri Jehova.

9. Ma mb͕e onye nwuru anwu gānwu n'akuku-ya na ntabi-anya, na mberede, o we merua isi nkewaputa-ya; ọ gākọpu kwa isi-ya n'ubọchi anēme ya ka ọ di ọcha, n'ubọchi nke-asa ka ọ gakọpu ya.

Ọnu-Ọgugu 6