Ọnu-Ọgugu 6:3-10 Bible Nso (IGBOB)

3. na manya-vine na ihe-ọṅuṅu nābà n'anya ka ọ gēkewaputa onwe-ya; ọ gaghi-aṅu manya-vine b͕ara uka, ma-ọbu ihe- ọṅuṅu nābà n'anya b͕ara uka, ọ gaghi-aṅu kwa miri nkpuru-vine ọ bula, ọ gaghi-eri kwa nkpuru-vine ọhu ma-ọbu nke amikọrọ amikọ.

4. Ubọchi nile nke nkewaputa-ya ọ dighi ihe nime ihe ọ bula emere site n'osisi vine nke manya-vine o gēri, site na nkpuru-ime-ya we rue mb͕ub͕ọ-ya.

5. Ubọchi nile nke nkwa nkwaputa-ya ọ dighi aguba gāgabiga n'isi-ya: rue ozùzù ubọchi nile, nke ọ nēkewaputara Jehova onwe-ya nsọ ka ọ gādi, ọ gēme ka ntutu agiri-isi-ya to ogologo.

6. Ubọchi nile ọ nēkewaputara Jehova onwe-ya ọ dighi madu nwuru anwu ọ gābiaru nso.

7. Ọ gaghi-emeru onwe-ya bayere nna-ya, ma-ọbu bayere nne-ya, ma-ọbu bayere nwa-nne-ya nwoke, maọbu bayere nwa-nne-ya nwayi, mb͕e ha nwuru; n'ihi na nkewaputa Chineke-ya di n'isi-ya.

8. Ubọchi nile nke nkewaputa-ya nsọ ka ọ diri Jehova.

9. Ma mb͕e onye nwuru anwu gānwu n'akuku-ya na ntabi-anya, na mberede, o we merua isi nkewaputa-ya; ọ gākọpu kwa isi-ya n'ubọchi anēme ya ka ọ di ọcha, n'ubọchi nke-asa ka ọ gakọpu ya.

10. N'ubọchi nke-asatọ ọ gēwetara onye-nchu-àjà nduru abua, ma-ọbu umu-kpalakwukwu abua, rue ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute.

Ọnu-Ọgugu 6