Ọnu-Ọgugu 5:18-23 Bible Nso (IGBOB)

18. onye-nchu-àjà gēguzo kwa nwayi ahu n'iru Jehova, tọpu agiri-isi nwayi ahu, tiye onyinye-inata-iru-ọma nke ihe-ncheta n'ọbu-aka-ya abua, onyinye-inata-iru-ọma nke ekworo ka ọ bu: ma n'aka onye-nchu-àjà ka miri ilu ahu gādi nke nēweta ọbubu-ọnu:

19. onye-nchu-àjà gēme kwa ka ọ ṅua iyi, ọ gāsi nwayi ahu, Ọ buru na gi na nwoke edinaghi, ọ buru kwa na i jehieghi ime ihe ruru árú, mb͕e i nọ n'okpuru di-gi, gi pua na miri ilu a nke nēweta ọbubu-ọnu:

20. ma asi na gi onwe-gi ejehiewo, mb͕e i nọ n'okpuru di-gi, asi kwa na i rua árú, nwoke nābughi di-gi ewe ra aru n'aru-gi:

21. onye-nchu-àjà gēwere kwa iyi nke ọb͕ub͕a-iyi ahu me ka nwayi ahu ṅua iyi, onye-nchu-àjà gāsi nwayi ahu, Jehova gēme gi ka i buru ihe-ọb͕ub͕a-iyi ka i buru kwa ihe-oṅuṅu-iyi n'etiti ndi-gi, mb͕e Jehova nēme ka apata-ukwu-gi bua aru, me kwa ka afọ-gi za aza;

22. miri a nke nēweta ọbubu-ọnu gābà kwa na ngiri-afọ-gi, ime ka afọ-gi za aza, na ime ka apata-ukwu-gi bua aru: nwayi ahu gāsi kwa, Amen, Amen.

23. Onye-nchu-àjà gēde kwa ọb͕ub͕a-iyi ndia n'akwukwọ, o gēhichapu kwa ha nime miri ilu ahu:

Ọnu-Ọgugu 5