9. Ha gēwere kwa ákwà anunu, kpuchie ihe-idọba-oriọna nke ihe ahu nēnye ìhè, na oriọna-ya nile, na nkpa-ya nile, na ihe-ikpakepu-ọku-ya nile, na ihe-manu-ya nile, nke ha were jere ya ozi:
10. ha gētiye kwa ya na ihe-ya nile nime ihe-nkpuchi akpukpọ seal, tukwasi ya n'ihe eji bū ya
11. Ọ bu kwa n'elu ebe-ichu-àjà ọla-edo ahu ka ha gāb͕akwasi ákwà anunu, were kwa ihe-nkpuchi akpukpọ seal kpuchie ya, tiye kwa nkpa-n'aka-ya abua nime:
12. ha gēwere kwa ihe nile nke ije-ozi ahu, nke ha ji je ozi n'ebe nsọ ahu, tiye ha nime ákwà anunu, were kwa ihe-nkpuchi akpukpọ seal kpuchie ha, tukwasi ha n'ihe eji bū ha.
13. Ha gēkpopu kwa ntu n'ebe-ichu-àjà, b͕akwasi n'elu ya ákwa ododo:
14. ha gētiye kwa n'elu ya ihe nile ya, nke ha ji je ozi n'akuku ya, bú ihe-igu-ọku-ya nile, na ndudu-ya nile, na osekè-ya nile, na ọkwa-nwusa-ya, ihe nile nke ebe-ichu-àjà ahu; ha gāb͕akwasi kwa n'elu ya ihe-nkpuchi akpukpọ seal, tinye kwa nkpa-n'aka-ya abua nime.
15. Ma mb͕e Eron na umu-ya ndikom kpuchisiri ebe nsọ ahu, na ihe nile nke ebe nsọ ahu, nime nbuli-ije nke ọmuma-ulo-ikwū; emesia, umu Kohat gābia ibū ya: ma ha agaghi-emetu ebe nsọ ahu aka, ha we ghara inwu. Ihe ndia bu ibu umu Kohat n'ulo-ikwū nzute.
16. Ihe-nlekọta Eleeza nwa Eron onye-nchu-àjà bu manu nke ihe nēnye ìhè, na ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ eji uda utọ di iche iche me, na onyinye-inata-iru-ọma anēnye mb͕e dum, na manu nke otite-manu ahu, ihe-nlekọta nke ebe-obibi ahu nile, na nke ihe nile di nime ya, bú nime ebe nsọ ahu na nime ihe-ya nile.
17. Jehova we gwa Moses na Eron okwu, si,
18. Unu ebipula ebo nke ab͕uru nile nke ndi Kohat n'etiti ndi Livai:
19. ma menu ha nka, ka ha we di ndu, ghara inwu, mb͕e ha nābiaru ebe nsọ ahu kachasi ebe nsọ nile nso: Eron na umu-ya ndikom gābata, do ha, nwoke ọ bula n'òfùfè-ya na n'ibu- ya:
20. ma ha agaghi-abata ihu ebe nsọ ahu ọbuná na obere oge, ka ha ghara inwu.
21. Jehova we gwa Moses okwu, si,
22. Guta kwa ọnu-ọgugu umu Giashon. ha onwe-ha, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, dika ab͕uru nile ha si di;
23. site n'onye b͕ara orú arọ na iri we gaba n'iru rue onye b͕ara ọgu arọ abua na iri ka i gāgukọta ha; onye ọ bula nke nābà ibu agha, ifè òfùfè n'ulo-ikwū nzute.
24. Nka bu òfùfè nke ab͕uru nile nke ndi Giashon, ifè òfùfè na ibū ibu:
25. ha gēbu kwa ákwà-nkwuba nile nke ebe-obibim, na ulo-ikwū nzute, ihe-nkpuchi-ya, na ihe-nkpuchi akpukpọ seal nke dikwasiri ya n'elu, na ákwà-nkwuchi di n'ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute;
26. na ákwà-ngechi nile nke ogige ahu, na ákwà-nkwuchi di n'onu-uzọ nke ọnu-uzọ-ama nke ogige ahu, nke di n'akuku ebe-obibi ahu na n'akuku ebe-ichu-àjà buruburu, na udọ̀ nile ha, na ihe nile nke òfùfè-ha, na ihe ọ bula agēmere ha, ha gēfè kwa òfùfè nime ya.
27. N'okwu-ọnu Eron na umu-ya ndikom ka òfùfè nile nke umu ndi Giashon gādi, n'ibu-ha nile, na n'òfùfè-ha nile: unu gēme kwa ka ha nēlekọta ibu-ha nile n'ihe-ndebe-ha.