Ọnu-Ọgugu 36:10-13 Bible Nso (IGBOB)

10. Dika Jehova nyere Moses iwu, otú a ka umu-ndinyom Zelọfehad mere:

11. Mahla, na Tiaza, na Họgla, na Milka, na Noa, bú umu-ndinyom Zelọfehad, we buru nwunye umu umu-nne nna-ha.

12. Ọ bu ndikom nke sitere n'ab͕uru umu Manase nwa Josef ka ha buru nwunye, ihe-nketa-ha we digide n'ebo nke ab͕uru nna-ha.

13. Ndia bu ihe enyere n'iwu, na ikpé, nke Jehova nyere umu Israel n'iwu n'aka Moses n'ala ihe nādighi nke Moab n'akuku Jọdan na nso Jeriko.

Ọnu-Ọgugu 36