Ọnu-Ọgugu 30:4-9 Bible Nso (IGBOB)

4. nna-ya we nu nkwa-ya, na isọ-nsọ-ya o ji ke nkpuru-obi-ya ab͕u, ma nna-ya b͕ara ya nkiti: nkwa-ya nile gēguzosi kwa ike, isọ-nsọ ọ bula nke o ji ke nkpuru-obi-ya ab͕u gēguzosi kwa ike.

5. Ma ọ buru na nna-ya si ya, É-è, n'ubọchi ọ nuru ya; ọ dighi ihe ọ bula nime nkwa-ya nile, ma-ọbu nime isọ-nsọ-ya nile nke o ji ke nkpuru-obi-ya ab͕u, gēguzosi ike: Jehova gab͕aghara kwa ya, n'ihi na nna-ya si ya, É-è.

6. Ma ọ buru na nwoke alua ya na nwunye ma-ọli, mb͕e nkwa-ya nile dikwasi ya, ma-ọbu okwu efu ahu nke eb͕ub͕ere-ọnu-ya, nke o ji ke nkpuru-obi-ya ab͕u;

7. di-ya we nu ya, ma ọ b͕ara ya nkiti n'ubọchi ọ nuru ya: nkwa-ya nile gēguzosi kwa ike, isọ-nsọ nile, nke o ji ke nkpuru-obi-ya ab͕u, gēguzosi kwa ike.

8. Ma ọ buru na di-ya si ya, É-è, n'ubọchi ọ nuru ya; ọ gēmebi kwa nkwa-ya nke dikwasi ya, na okwu efu ahu nke eb͕ub͕ere-ọnu-ya, nke o ji ke nkpuru-obi-ya: Jehova gāb͕aghara kwa ya.

9. Ma nkwa nke nwayi di-ya nwuru, ma-ọbu nke nwayi achupuru achupu, bú ihe ọ bula nke o ji ke nkpuru-obi-ya ab͕u, o gēguzosi ike megide ya.

Ọnu-Ọgugu 30