35. N'ubọchi nke-asatọ nb͕ochi gādiri unu: ọ dighi ozi ọ bula nke òfufè unu gēje:
36. ma unu gēweta nso àjà-nsure-ọku. bú àjà-ọku nke ihe ísì utọ anāchuru Jehova:' otú oke-ehi, otú ebulu, umu-aturu asa nke b͕ara otù arọ, nke zuru okè:
37. onyinye-inata-iru-ọma-ha, na àjà-ihe-oṅuṅu nile ha, iji chu oke-ehi ahu, na iji chu ebulu ahu, na iji chu umu-aturu ahu, gādi n'ọnu-ọgugu-ha, dika ikpé ahu si di:
38. na otù nkpi iji chu aja-nmehie; nāgughi àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, na onyinye-inata-iru-ọma-ya, na àjà-ihe-ọṅuṅu-ya.
39. Ndia ka unu gēmere Jehova na mb͕e nile unu akara àkà, nāgughi nkwa nile unu, na onyinye-afọ-ofufo nile unu, iji chu àjà-nsure-ọku nile unu, na iji chu onyinye-inata-iru-ọma nile unu, na iji chu àjà-ihe-ọṅuṅu nile unu, na iji chu àjà-udo nile unu.
40. Moses we gwa umu Israel okwu dika ihe nile nke Jehova nyere Moses n'iwu si di.