Ọnu-Ọgugu 22:37-41 Bible Nso (IGBOB)

37. Belak we si Belam, Èziteghm ozi ike ike n'ebe i nọ ikpọ gi? n'ìhi gini ka i nābiakuteghm? ọ̀ bu ezi-okwu na apughm isọpuru gi?

38. Belam we si Belak, abiakutewom i: ub͕u a ọ̀ di ike ọ bula m'nwere ikwu ihe ọ bula? okwu ahu nke Chineke gētiye n'ọnum, nke ahu ka m'gēkwu.

39. Belam we soro Belak je, ha we biarue Kiriat-huzot.

40. Belak we chua ìgwè ehi na ìgwè ewu na aturu n'àjà, we zigara Belam, ziga-kwa-ra ndi-isi ndi ha na ya nọ.

41. O rue, n'ututu, na Belak kuru Belam, me ka ọ rigo na Bamot-beal, ọ we si n'ebe ahu hu nsọtu ndi Israel.

Ọnu-Ọgugu 22