Ọnu-Ọgugu 18:26-31 Bible Nso (IGBOB)

26. I gāgwa kwa ndi Livai okwu, si ha, Mb͕e unu nānara n'aka umu Israel otù uzọ n'uzọ iri nke M'nyeworo unu site n'aka-ha, dika ihe-nketa-unu, unu gēsi kwa na ya bulie àjà-nbuli nke Jehova, bú otù uzọ n'uzọ iri nke si n'otù uzọ n'uzọ iri ahu puta.

27. Agāgu-kwa-ra unu àjà-nbuli-unu, dika ọka nke si n'ebe-nzọcha-ọka puta, na dika ojuju-manya-vine nke si n'ebe-nzọcha-nkpuru-vine puta.

28. Otú a ka unu gēbuli, ọbuná unu onwe-unu, àjà-nbuli nke Jehova sitere n'otù uzọ n'uzọ iri nke ihe unu nile, nke unu nānara n'aka umu Israel; unu gēsi kwa na ya nye Eron, bú onye-nchu-àjà, àjà-nbuli nke Jehova.

29. Unu gēsi n'onyinye-unu nile bulie àjà-nbuli ọ bula nke Jehova, site n'ihe-ya nile kachasi nma, bú ihe nsọ ya sitere na ya.

30. I gāsi kwa ha, Mb͕e unu nēsi na ya bulie ihe-ya kachasi nma, agāgu-kwa-ra ndi Livai ya dika ihe-ọmume nke ebe-nzọcha-ọka, na dika ihe-ọmume nke ebe-nzọcha-nkpuru-vine.

31. Unu gēri kwa ya n'ebe ọ bula, unu onwe-unu na ulo nile unu: n'ihi na ugwọ-ọlu ka ọ buru unu, bú ihe-nkwughachi òfùfè-unu n'ulo-ikwū nzute.

Ọnu-Ọgugu 18