Ọnu-Ọgugu 18:13-27 Bible Nso (IGBOB)

13. Nkpuru mbu nke ihe nile di n'ala-ha, nke ha nēwetara Jehova, nke gi ka ọ bu; onye ọ bula nke di ọcha n'ulo-gi gēri ya.

14. Ihe ọ bula ewezugara ka ebibie ya n'Israel, nke gi ka ọ bu.

15. Nwa ọ bula nke meghere àkpà-nwa, nke anu-aru nile nke ha nēweta nso Jehova, n'etiti madu na n'etiti anu-ulo, ọ bu nke gi: nání i ghaghi ib͕aputa nwa madu buru uzọ mu, nwa anu-ulo ruru árú buru uzọ mu ka i gāb͕aputa kwa.

16. Ma ndi-ha anāb͕aputa site na nke ruru otù ọnwa ka i gāb͕aputa, dika ọ̀rùrù-ọnu-gi si di, n'ọla-ọcha shekel ise, dika shekel nke ebe nsọm si di (orú gerah ka ọ bu).

17. Ma otú ọ di, nwa ehi buru uzọ mu, ma-ọbu nwa aturu buru uzọ mu, ma-ọbu nwa ewu buru uzọ mu, i gaghi-ab͕aputa ha; ihe nsọ ka ha bu: i gāwusa ọbara-ha n'ebe-ichu-àjàm, sure kwa abuba-ha ọku ibu ihe nsure-ọku nēsì ísì utọ, ka ọ buru àjà-ọku, ime ihe ísì utọ anēsurere Jehova.

18. Anu-ha bu kwa nke gi, dika okpukpu-obi nke àjà-ofufé, na dika utaku-ukwu aka-nri, nke gi ka ọ bu.

19. Àjà-nbuli nile nke ihe nsọ nile, nke umu Israel nēbuliri Jehova, ka M'nyeworo gi, nye kwa umu-gi ndikom, nye kwa umu-gi ndinyom, tiyere gi, n'ukpuru ebighi-ebi: ọb͕ub͕a-ndu nnú ebighi-ebi n'iru Jehova ka ọ buru gi, buru kwa nkpuru-gi tiyere gi.

20. Jehova we si Eron, I gaghi-eketa ihe n'ala-ha, ọ dighi kwa òkè i gēnwe n'etiti ha: Mu onwem bu òkè-gi na ihe-nketa-gi n'etti umu Israel.

21. Ma umu Livai, le, ha ka M'nyeworo otù uzọ n'uzọ iri nke ihe nile n'Israel, ibu ihe-nketa, dika ihe-nkwughachi òfùfè-ha, nke ha onwe-ha nēfè, bú òfùfè nke ulo-ikwū nzute.

22. Ma umu Israel agaghi-abiaru nso ulo-ikwū nzute ahu ọzọ ibū nmehie, inwu anwu.

23. Ma ndi Livai gēfè òfùfè ahu nke ulo-ikwū nzute, ha onwe-ha gēbu kwa ajọ omume-ha: ukpuru ebighi-ebi ka ọ bu rue ọb͕ọ nile unu, ma n'etiti umu Israel ha agaghi-eketa ihe-nketa.

24. N'ihi na ọ bu otù uzọ n'uzọ iri nke ihe umu Israel, nke ha nēbuliri Jehova dika àjà-nbuli, ka M'nyeworo ndi Livai, ibu ihe-nketa: ya mere M'siworo ha, N'etiti umu Israel ha agaghi-eketa ihe-nketa.

25. Jehova we gwa Moses okwu, si,

26. I gāgwa kwa ndi Livai okwu, si ha, Mb͕e unu nānara n'aka umu Israel otù uzọ n'uzọ iri nke M'nyeworo unu site n'aka-ha, dika ihe-nketa-unu, unu gēsi kwa na ya bulie àjà-nbuli nke Jehova, bú otù uzọ n'uzọ iri nke si n'otù uzọ n'uzọ iri ahu puta.

27. Agāgu-kwa-ra unu àjà-nbuli-unu, dika ọka nke si n'ebe-nzọcha-ọka puta, na dika ojuju-manya-vine nke si n'ebe-nzọcha-nkpuru-vine puta.

Ọnu-Ọgugu 18