Ọnu-Ọgugu 15:31-40 Bible Nso (IGBOB)

31. N'ihi na ọ bu okwu Jehova ka ọ lelíworo anya, n'ihi kwa na ọ bu ihe O nyere n'iwu ka o mebiworo; agēbipu nkpuru-obi ahu ebipu, ajọ omume-ya gādikwasi ya.

32. Umu Israel we nọ n'ọzara, ha we huta otù nwoke ka ọ nāchikọta nkú n'ubọchi-izu-ike.

33. Ndi hutara ya ka ọ nāchikọta nkú we me ka ọ biakute Moses na Eron na nzukọ Israel nile.

34. Ha we me ka ọ nọdu n'ebe anēdebe ndi-nkpọrọ, n'ihi na agwaghi ha ihe banyere ya, bú ihe agēme ya.

35. Jehova we si Moses, Aghaghi ime ka nwoke ahu nwua: nzukọ Israel nile gēwere nkume tub͕ue ya n'azu ọmuma-ulo-ikwū.

36. Nzukọ ahu nile we me ka ọ pua je n'azu ọmuma-ulo-ikwū, ha we were nkume tub͕ue ya, ọ we nwua; dika Jehova nyere Moses iwu.

37. Jehova we gwa Moses okwu, si,

38. Gwa umu Israel okwu, si ha mere onwe-ha ọnu-ọnu n'elu usọ uwe-ha rue ọb͕ọ nile ha, tiyekwasi kwa n'ọnu-ọnu nke usọ uwe ahu eriri-nma ogho anunu:

39. ọ gābu-kwa-ra unu ọnu-ọnu usọ uwe, ka unu we hu ya anya, we cheta ihe nile Jehova nyere n'iwu, me kwa ha; ka unu we ghara kwa iledo otú unu gēso obi-unu, otú unu gēso kwa anya-unu, nke unu onwe-unu nēso ha ikwa iko:

40. ka unu we cheta me kwa ihe nile M'nyere n'iwu, buru kwa ndi diri Chineke-unu nsọ.

Ọnu-Ọgugu 15