Ọnu-Ọgugu 15:28-33 Bible Nso (IGBOB)

28. Onye-nchu-àjà gēkpuchi-kwa-ra nkpuru-obi ahu nmehie-ya, bú nke nēme ihe n'amaghi-ama, mb͕e ọ nēmehie n'amaghi-ama, n'iru Jehova, ikpuchiri ya nmehie-ya; agāb͕aghara kwa ya.

29. Ma onye amuru n'ala n'etiti umu Israel, ma ọbìa nke nọ dika ọbìa n'etiti ha, otù iwu ka unu gēnwe bayere onye nēme ihe n'amaghi-ama.

30. Ma nkpuru-obi ahu nke nēwere aka npako me ihe, ma ọ bu onye amuru n'ala ma-ọbu ọbìa, Jehova ka onye ahu nēkwulu; agēbipu kwa nkpuru-obi ahu n'etiti ndi-ya.

31. N'ihi na ọ bu okwu Jehova ka ọ lelíworo anya, n'ihi kwa na ọ bu ihe O nyere n'iwu ka o mebiworo; agēbipu nkpuru-obi ahu ebipu, ajọ omume-ya gādikwasi ya.

32. Umu Israel we nọ n'ọzara, ha we huta otù nwoke ka ọ nāchikọta nkú n'ubọchi-izu-ike.

33. Ndi hutara ya ka ọ nāchikọta nkú we me ka ọ biakute Moses na Eron na nzukọ Israel nile.

Ọnu-Ọgugu 15